Psalms 64:5

“Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?””

Psalms 64:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 5 of 10 in Psalms chapter 64 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 64 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nụrụ olu m O , mgbe m na-akọsara gị ihe na-esogbu m. Chebe ndụ m site nʼaka ndị iro m. Zopu m pụọ nʼizu nzuzo niile nke ndị ọjọọ, site nʼatụmatụ ndị na-eme ajọ ihe. Ha na-amụ ire ha dịka e si amụ mma agha, na-agbapụ okwu dịka àkụ ọjọọ. Ha na-agba onye na-enweghị ihe o mere àkụ site nʼebe nzuzo, na mberede ka ha na-agba ya, na-atụghị egwu. Ha na-agbarịta ibe ha ume na-atụmatụ ọjọọ, ha na-ekwu banyere isi ọnya ha na nzuzo, ha na-asị, “Onye ga-ahụ ya?” Ha na-atụpụta atụmatụ ọjọọ na-asị, “Anyị echepụtala atụmatụ zuruoke!” Nʼezie, uche na obi mmadụ dị aghụghọ. Ma ga-agba ha àkụ, na mberede ka a ga-etida ha. Ọ ga-atụgharị okwu ọnụ ha megide ha, mee ka ha laa nʼiyi; ndị niile hụrụ ha ga-efufe isi ha nʼịkwa emo. Mmadụ niile ga-atụ egwu, ha ga-ekwupụta ọrụ niile nke , ma tụgharịa uche nke ọma banyere ihe o mere. Ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ nʼime anyị, ha ga-agbabakwa nʼime ya; ndị niile obi ha ziri ezi ga-anyakwa isi nʼime ya.

Every verse in Psalms 64

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00