Psalms 67:4

“Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela”

Psalms 67:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 4 of 7 in Psalms chapter 67 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 67 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ka meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. Ka mmadụ niile too gị, O ; ka mmadụ niile too gị. Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Ka mmadụ niile too gị, O ; ka mmadụ niile too gị. Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ anyị, ga-agọzikwa anyị. Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.

Every verse in Psalms 67

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00