Psalms 75:9
“Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,”
Psalms 75:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 10 in Psalms chapter 75 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 75 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Anyị na-eto gị, O . Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso. Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche. Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka. Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi. Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji, ọ bụ m na-ejidesi ogidi ya ike ka o guzo chịm. Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ, nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi unu elu. Unu ewelila mpi unu megide eluigwe; unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ” Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ, maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu. Kama ọ bụ , onye na-ekpe ikpe; ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala. Otu iko dị nʼaka anyị nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche. Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị. Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi. Aga m abụku nke ọb abụ otuto, bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile, ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”
Every verse in Psalms 75
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.