Psalms 79:13

“Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”

Psalms 79:13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 13 of 13 in Psalms chapter 79 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 79 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O , mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, ha etikpọọla , mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. Ha awụpụla ọbara dịka mmiri nʼakụkụ niile nke , ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga- ndị nwụrụ anwụ. Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo. O anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ? Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị dịka oke iwe gị, bụ alaeze niile ndị ahụ na-adịghị akpọku aha gị; nʼihi na ha eripịala ọb mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu. Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. Nyere anyị aka, O , Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị. Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ha nọ?” Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru. Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị nʼihi ụta ha tara gị, O anyị. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; anyị ga na-ekwupụta otuto gị, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Every verse in Psalms 79

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00