Psalms

Psalms 82

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context

Psalms 82 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Chineke na-ewere ọnọdụ ịchị isi nʼetiti ọgbakọ dị ukwuu; ọ na-ekpebi ikpe nʼetiti chi niile. Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Ruo ole mgbe ka unu ga na-egosi ndị ajọ omume ihuọma? Kperenụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị nna ikpe ziri ezi; hụnụ na ndị ogbenye na ndị a na-emegbu nwetara ihe ruuru ha. Gbapụtanụ ndị na-adịghị ike na ndị nọ na mkpa; napụta ha site nʼaka ndị ajọ omume. Ha amaghị ihe ọbụla, ha aghọtaghị ihe ọbụla. Ha na-ejegharị nʼọchịchịrị; ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji. “Asịrị m, ‘Unu bụ “chi,” unu niile bụ ụmụ ndị ikom nke kachasị ihe niile elu.’ Ma unu ga-anwụ ọnwụ dịka mmadụ ndị ọzọ; unu ga-ada dịka ndị ọchịchị ọzọ.” O , bilie kpee ụwa ikpe, nʼihi na mba niile bụ ihe nketa gị.

Every verse in Psalms 82

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00