Psalms 85:5

“Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile?”

Psalms 85:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 5 of 13 in Psalms chapter 85 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 85 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, i gosila ala gị ihuọma; i nyeghachila ọb akụnụba ya. I gbagharala ajọ omume ndị gị, kpuchikwaa mmehie ha niile. Ị kwụsịla iwe oke iwe gị, I sikwala nʼịdị ọkụ nke iwe gị chigharịa. Kpọghachi anyị azụ, O , Onye Nzọpụta anyị, wezuga iwe gị site nʼebe anyị nọ. Ọ bụ ruo mgbe ebighị ebi, ka ị ga na-eweso anyị iwe: Ị ga-eme ka iwe gị dịgide ruo ọgbọ niile? Ị gaghị eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ ka ndị gị ṅụrịa ọṅụ nʼime gị? O anyị, gosi anyị ịhụnanya gị nke na-adịgide, nyekwa anyị nzọpụta gị. Aga m ege ntị mara ihe , onye bụ anyị ga-ekwu; ọ na-ekwe ndị ya, ndị nsọ ya nkwa udo, ma ka ha ghara ịlọghachi na nzuzu. Nʼezie, nzọpụta ya dị nso ndị na-atụ egwu ya, ka ebube ya si otu a dịgide nʼala anyị. Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi ezukọtala; ezi omume na udo esutula ọnụ. Ikwesi ntụkwasị obi ga-esite nʼala pupụta, ezi omume ga-esite nʼeluigwe ledata anya. Nʼezie, Onyenwe anyị ga-enye ihe dị mma, ala anyị ga-amịkwa mkpụrụ ubi ya. Ezi omume ga-aga nʼihu ya, idoziri ya ụzọ ọ ga-esi gaa.

Every verse in Psalms 85

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00