MyBibleAtlasAbụ Ọma 88

Abụ Ọma

Abụ Ọma 88

Psalm 88 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 88Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names the sons of Korah and Heman the Ezrahite as its authors. This is a lament Psalm that cries out from overwhelming affliction and the experience of abandonment.

Abụ Ọma 88 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, Chineke onye na-azọpụta m, nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị.

KJV verse 1: O LORD God of my salvation, I have cried day and night before thee:

Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m.

KJV verse 2: Let my prayer come before thee: incline thine ear unto my cry;

Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ.

KJV verse 3: For my soul is full of troubles: and my life draweth nigh unto the grave.

Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.

KJV verse 4: I am counted with them that go down into the pit: I am as a man that hath no strength:

A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị.

KJV verse 5: Free among the dead, like the slain that lie in the grave, whom thou rememberest no more: and they are cut off from thy hand.

Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.

KJV verse 6: Thou hast laid me in the lowest pit, in darkness, in the deeps.

Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m.

KJV verse 7: Thy wrath lieth hard upon me, and thou hast afflicted me with all thy waves. Selah.

Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi;

KJV verse 8: Thou hast put away mine acquaintance far from me; thou hast made me an abomination unto them: I am shut up, and I cannot come forth.

anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,

KJV verse 9: Mine eye mourneth by reason of affliction: LORD, I have called daily upon thee, I have stretched out my hands unto thee.

ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị?

KJV verse 10: Wilt thou shew wonders to the dead? shall the dead arise and praise thee? Selah.

Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?

KJV verse 11: Shall thy lovingkindness be declared in the grave? or thy faithfulness in destruction?

A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ?

KJV verse 12: Shall thy wonders be known in the dark? and thy righteousness in the land of forgetfulness?

Ma anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.

KJV verse 13: But unto thee have I cried, O LORD; and in the morning shall my prayer prevent thee.

O anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?

KJV verse 14: LORD, why castest thou off my soul? why hidest thou thy face from me?

Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba.

KJV verse 15: I am afflicted and ready to die from my youth up: while I suffer thy terrors I am distracted.

Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi.

KJV verse 16: Thy fierce wrath goeth over me; thy terrors have cut me off.

Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.

KJV verse 17: They came round about me daily like water; they compassed me about together.

Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.

KJV verse 18: Lover and friend hast thou put far from me, and mine acquaintance into darkness.

Every verse in Abụ Ọma 88

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 880:00 / 0:00