Psalms 92:3

“jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ.”

Psalms 92:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 3 of 15 in Psalms chapter 92 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 92 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ọ bụ ihe ziri ezi ito anyị, na iti egwu nye aha gị, gị kachasị ihe niile elu, ikwupụta ịhụnanya gị nʼụtụtụ, na ikwesi ntụkwasị obi gị nʼabalị, jiri ihe iti egwu ụbọ akwara na une bụọrọ gị abụ dị ụtọ. Nʼihi na ị na-eme ka obi dị m ụtọ, site nʼọrụ gị niile, o anyị, Ọ bụ ya mere m ji na-abụ abụ ọṅụ. Lee ka ọrụ gị si dị ukwuu, Onyenwe anyị. Leekwa ụdị echiche miri emi ị na-eche. Ndị uche kọrọ amaghị nke a, ndị nzuzu enweghị nghọta, ọ bụ ezie na ndị ajọ omume na-etopụta dịka ahịhịa ndị na-emekwa ajọ ihe na-eto na-awasa, a ga-ala ha nʼiyi ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị, O anyị, bụ onye e buliri elu ruo mgbe ebighị ebi. Nʼezie, ndị iro gị niile, Onyenwe anyị, e ndị iro gị niile ga-ala nʼiyi; ndị niile na-eme ajọ ihe ka a ga-achụsasị. I meela ka mpi m dị elu dịka oke ehi na-akpa ike; awụsala m mmanụ dị mma. Ejirila m anya m abụọ hụ ka e meriri ndị iro m; ejirila m ntị m nụ maka ịla nʼiyi nke ndị iro m afọ tara mmiri. Ma ndị ezi omume ga-awa igu dịka osisi nkwụ; ha ga-ebukwa ibu dịka osisi ukwu sida nke ọn, nke a kụrụ nʼime ụlọ anyị, ha ga-eto, wasaakwa nʼime ogige anyị. Ha ga-amị mkpụrụ, ọ bụladị mgbe ha mere agadi. Ha ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ, na-ekwupụta, “Onyenwe anyị bụ ziri ezi; ọ bụ m, ọ dịkwaghị ajọ omume dị nʼime ya.”

Every verse in Psalms 92

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00