Psalms
Psalms 98
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible · tap any highlighted word for context
Psalms 98 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Bụkuonụ anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta anyị. Tikusienụ anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; werenụ ụbọ akwara bụkuo anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu anyị, Onye bụ . Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, ụwa na ndị niile bi nʼime ya. Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ; ka ha bụọ abụ nʼihu anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Every verse in Psalms 98
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.