Romans 15:10
“O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.””
Romans 15:10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 10 of 33 in Romans chapter 15 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Romans 15 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Anyị onwe anyị bụ ndị dị ike kwesiri ịnagide mgbe ndị na-adịghị ike mejọrọ anyị, ọ bụghị ime ihe ga-atọ anyị ụtọ. Ka onye ọbụla nʼime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbataobi ya ụtọ maka ọdịmma ha, ka o wulie ha elu. Nʼihi na ịst nʼonwe ya emeghị ihe tọrọ ya ụtọ, kama dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Mkparị niile nke ndị na-akparị gị dakwasịrị m!” Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya. Ka ahụ na-enye agbamume na ntachiobi nye unu mmụọ nke ịdị nʼotu nʼetiti onwe unu, dịka ịst ọs nwere. Nʼihi na nke a ga-eme ka unu niile jikọtaa obi unu, na olu unu nʼotu, inye na anyị ọs ịst otuto. Nʼihi ya, nabatanụ onwe unu dị ka ịst nabatara unu, iji wetara otuto. Ma ana m agwa unu na ịst aghọọla onye na-ejere ndị e biri ugwu ozi nʼihi eziokwu nke , iji mee ka nkwa e kwere ndị bụ nna nna anyị ochie guzozie. Ka ndị mba ọzọ nwe ike inye otuto maka ebere ya, dịka e dere ya, “Nʼihi nke a, aga m eto gị nʼetiti ndị mba ọzọ, aga m abụ abụ nye aha gị.” O kwukwara ọzọ sị, “Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ unu ndị mba ọzọ.” Ọzọkwa, “Toonu anyị unu ndị mba ọzọ niile, ka ndị niile dị iche iche jaakwa ya mma.” Ọzọkwa, Aịzaya na-asị, “Mgbọrọgwụ ga-epulite ọzọ, onye nke ga-ebili ịchị mba niile, ndị mba ọzọ ga-enwekwa olileanya nʼime ya.” Ka onye bụ isi olileanya mejupụta unu nʼoke ọṅụ na udo dịka unu na-atụkwasị ya obi, ka unu si otu a bụrụ ndị olileanya ha jubigara oke site nʼike nke Mmụọ Nsọ. Ụmụnna m, o doro m anya na unu onwe unu jupụtara nʼịdị mma, bụrụkwa ndị tozuru etozu nʼihe ọmụma ruo na unu nwere ike izirịta onwe unu ihe. Ma otu ọ dị, edepụtala m ụfọdụ isi okwu nʼebe o doro anya nye unu, iji chetara unu ha ọzọ, nʼihi amara nyere m, abụ m onyeozi ịst ọs, ana m arụkwa ọrụ onye nchụaja nʼizisa oziọma , ka ofufe ndị mba ọzọ bụrụ aja ga-anara nke ọma, nke Mmụọ Nsọ dokwara nsọ. Nʼihi ya, ana m anya isi nʼime ịst ọs banyere ọrụ m na-arụrụ . Agaghị m anwa anwa kwuo okwu banyere ihe ọzọ karịakwa ihe ndị ahụ ịst rụpụtara site nʼaka m, bụ idubata ndị mba ọzọ, ime ka ha rube isi nye , site nʼokwu ọnụ m na ihe m rụrụ, nke pụtara ihe nʼọrụ ebube na ihe ịrịbama site nʼike nke Mmụọ nke . Ya mere, site na ruo , ekwusaala m nʼụzọ zuru ezu, oziọma ịst. Ọchịchọ obi m mgbe niile bụ ikwusa oziọma ahụ nʼebe ọbụla ndị mmadụ na-anụtụbeghị ihe banyere ịst, ka m ghara ịbụ onye na-ewukwasị ihe nʼelu ntọala nke onye ọzọ tọrọ, ma dịka e dere ya, “Ndị a na-agwaghị ihe banyere ya ga-ahụ, ndị a ka anụbeghị, ga-aghọtakwa.” Nʼezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu. Nʼihi na ọ dịla ọtụtụ afọ kemgbe m bidoro na-enwe mmasị m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a, ọrụ m nwere nʼakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a. Nʼihi na nzube m bụ ijeru obodo . Mgbe ọbụla m ga-agakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na elekwa anya na unu ga-edupụ m nʼije m, mgbe mụ na unu jiri ọṅụ nọrọtụ nwa mgbe nta. Ma ugbu a, ana m aga ebe m na-ejere ndị nsọ ozi. Nʼihi na ọ dị ndị na ịa ezi mma iwere nʼụfọdụ nʼihe ha nwere nyere ndị ogbenye nọ nʼetiti ndị nsọ nọ na aka. Ha ji ọṅụ mee nke a, nʼezie ha ji ha ụgwọ i mere ha otu a. Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ so ha keta oke na ngọzị nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nʼakụnụba ha nwere kenye ha. Ya mere, mgbe m mezuru nke a, hụkwa na ha anatala onyinye ahụ a tụkọtara ha, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga . Amaara m na mgbe m ga-abịakwute unu, aga m abịa nʼime ozuzu oke ngọzị nke ịst. Esi m nʼaka anyị ọs ịst na ịhụnanya anyị nwere nʼime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m na-ekpe ekpere, na-echetanụ m nʼekpere unu nʼihu . Ka a dọpụta m nʼaka ndị na-ekweghị ekwe nọ na ịa. Ka ọrụ m maka bụrụ ihe ndị nsọ nọ ebe ahụ ga-anabata. Ka ọ ga-abụ site nʼuche , aga m abịakwute unu nʼọṅụ kurukwa ume ndụ na nnọkọ mụ na unu. Ka ahụ na-enye udo, nọnyere unu niile. Amen.
Every verse in Romans 15
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.