MyBibleAtlasAbụ Ọma 101

Abụ Ọma

Abụ Ọma 101

Psalm 101 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 101Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a royal Psalm that commits the ruler to integrity, justice and rejection of wickedness.

Abụ Ọma 101 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto.

KJV verse 1: I will sing of mercy and judgment: unto thee, O LORD, will I sing.

Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m.

KJV verse 2: I will behave myself wisely in a perfect way. O when wilt thou come unto me? I will walk within my house with a perfect heart.

Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya.

KJV verse 3: I will set no wicked thing before mine eyes: I hate the work of them that turn aside; it shall not cleave to me.

Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla.

KJV verse 4: A froward heart shall depart from me: I will not know a wicked person.

Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.

KJV verse 5: Whoso privily slandereth his neighbour, him will I cut off: him that hath an high look and a proud heart will not I suffer.

Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi.

KJV verse 6: Mine eyes shall be upon the faithful of the land, that they may dwell with me: he that walketh in a perfect way, he shall serve me.

Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m.

KJV verse 7: He that worketh deceit shall not dwell within my house: he that telleth lies shall not tarry in my sight.

Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo anyị.

KJV verse 8: I will early destroy all the wicked of the land; that I may cut off all wicked doers from the city of the LORD.

Every verse in Abụ Ọma 101

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 1010:00 / 0:00