Psalms 101:5

“Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga.”

Psalms 101:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 5 of 8 in Psalms chapter 101 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 101 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị na ikpe gị ziri ezi; o anyị, ọ bụ gị ka m ga-abụku abụ otuto. Aga m enwe uche ị hụ na m biri ndụ na-enweghị ịta ụta ọbụla, olee mgbe ị ga-abịakwute m? Aga m ejikwa obi nke a na-agaghị ata ụta ọbụla jegharịa nʼime ụlọ m. Agaghị m edo ihe jọgburu onwe ya nʼihu m. Ana m akpọ ọrụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi asị. Agaghị m enwekwa oke nʼime ya. Ndị obi ha gbagọrọ agbagọ agaghị anọ m nso. Agakwaghị m etinye aka nʼọrụ ọjọọ ọbụla. Onye ọbụla na-ekwulu onye agbataobi ya na nzuzo, onye ahụ ka m ga-emechi ọnụ; agaghị m anabata onye ọbụla dị mpako ma nwee obi nganga. Aga m elekwasị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼala a anya, ka mụ na ha biri; onye ahụ na-eje ije na-enweghị ịta ụta ọbụla ga-ejere m ozi. Onye ọbụla na-aghọ aghụghọ agaghị ebi nʼụlọ m; onye ọbụla na-ekwu okwu ụgha agaghị eguzokwa nʼihu m. Ụtụtụ niile ka m na-eme ka ha dere duu bụ ndị ajọ omume niile nọ nʼala a; Aga m ebipụ ndị niile na-eme ajọ ihe site nʼobodo anyị.

Every verse in Psalms 101

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00