Psalms 102:23

“O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ.”

Psalms 102:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 23 of 28 in Psalms chapter 102 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 102 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nụrụ ekpere m, O anyị; ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa. Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ; ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ. Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa; ana m echefu iri nri m. Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ. Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara, a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị. Ana m amụ anya abalị niile; adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ. Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ. Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ. Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. Ma gị anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe ọn nọ, nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola; oge ahụ a kara aka eruola. Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị; mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. Mba niile ga-atụ egwu aha anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. Nʼihi na anyị ga-ewugharị ọn, ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa; ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu, ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too anyị: “Onyenwe anyị sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya, o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọ na ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha anyị na ọn; a ga-eto ya na , mgbe mba niile na alaeze niile, ga-ezukọta nʼotu ebe, ife anyị ofufe. O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m; o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. Nʼihi ya, ekwuru m sị, “Anapụla m ndụ m, o m, ugbu a m ka dị ndụ; ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide; ha ga-erichasị dịka akwa ochie. Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya, ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ. Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”

Every verse in Psalms 102

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00