Psalms 103:10
“ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị.”
Psalms 103:10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 10 of 22 in Psalms chapter 103 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 103 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mkpụrụobi m, too anyị; ka ihe niile dị nʼime m too aha nsọ ya. Mkpụrụobi m, too anyị; echefukwala mmeso ọma ya niile, ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo. Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ezi omume, na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu. O mere ka mata ụzọ ya, mekwaa ka ụmụ mara ọrụ ya dị iche iche: Onyenwe anyị nwere obi ọmịiko na-emekwa amara. Ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, o jupụtara nʼịhụnanya. Iwe ya anaghị adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị oge niile ka ọ na-anọgide na-ata mmadụ ụta; ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ. Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja. Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa, ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya. Ma ịhụnanya anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha, nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi. Onyenwe anyị emeela ka ocheeze ya guzosie ike nʼeluigwe, alaeze ya na-achị ihe niile. Toonu anyị, unu ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dị ike ndị na-eme ihe ọ chọrọ, na-erubere okwu ya isi. Toonu anyị unu usuu ndị agha ya niile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme uche ya. Toonu anyị, ọrụ aka ya niile nʼebe ọbụla ọ na-achị. Mkpụrụobi m, too anyị.
Every verse in Psalms 103
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.