Psalms 123:2
“Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.”
Psalms 123:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 2 of 4 in Psalms chapter 123 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 123 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje, otu a ka anyị si na-elekwasị anyị bụ anyị anya, ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. Meere anyị ebere, O anyị, meere anyị ebere, nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. Nʼihi na nnagide anyị na-anagide ịchị ọchị ndị nganga, na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Every verse in Psalms 123
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.