Psalms 140:4
“Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m.”
Psalms 140:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 4 of 13 in Psalms chapter 140 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 140 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche. Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile. Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Chebe m anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m. Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. A sịrị m anyị, “Gị onwe gị bụ m.” Nụrụ, O anyị, olu arịrịọ m maka amara. Onye kachasị ihe niile elu, bụ anyị nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha. Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o anyị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike. Amaara m na anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha. Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
Every verse in Psalms 140
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.