MyBibleAtlasAbụ Ọma 141

Abụ Ọma

Abụ Ọma 141

Psalm 141 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 141Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a lament Psalm that offers prayer as incense and asks God to guard speech, desire and conduct.

Abụ Ọma 141 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị.

KJV verse 1: LORD, I cry unto thee: make haste unto me; give ear unto my voice, when I cry unto thee.

Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị.

KJV verse 2: Let my prayer be set forth before thee as incense; and the lifting up of my hands as the evening sacrifice.

Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o anyị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche.

KJV verse 3: Set a watch, O LORD, before my mouth; keep the door of my lips.

Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile.

KJV verse 4: Incline not my heart to any evil thing, to practise wicked works with men that work iniquity: and let me not eat of their dainties.

Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ.

KJV verse 5: Let the righteous smite me; it shall be a kindness: and let him reprove me; it shall be an excellent oil, which shall not break my head: for yet my prayer also shall be in their calamities.

A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu.

KJV verse 6: When their judges are overthrown in stony places, they shall hear my words; for they are sweet.

Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.”

KJV verse 7: Our bones are scattered at the grave’s mouth, as when one cutteth and cleaveth wood upon the earth.

Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ anyị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ.

KJV verse 8: But mine eyes are unto thee, O GOD the Lord: in thee is my trust; leave not my soul destitute.

Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m.

KJV verse 9: Keep me from the snares which they have laid for me, and the gins of the workers of iniquity.

Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.

KJV verse 10: Let the wicked fall into their own nets, whilst that I withal escape.

Every verse in Abụ Ọma 141

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 1410:00 / 0:00