Psalms 143:6
“Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela”
Psalms 143:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 6 of 12 in Psalms chapter 143 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 143 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O anyị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka. Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị. Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga. Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi. Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ. Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. O anyị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili. Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye. O anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m. Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị. O anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu. Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị.
Every verse in Psalms 143
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.