Psalms 148:12

“ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị.”

Psalms 148:12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 12 of 14 in Psalms chapter 148 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 148 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Toonu anyị. Toonu anyị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu. Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile. Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe. Ka ha niile too aha anyị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya. O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga. Toonu anyị, site nʼụwa, unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile, na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile, na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu, unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile, na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile, ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche, unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa, ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, ndị okenye na ụmụntakịrị. Ka ha niile too aha anyị, nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu; ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa. O meela ka mpi ndị ya dị elu, otuto ndị nsọ ya niile, nke ndị ọ hụrụ nʼanya. Toonu anyị.

Every verse in Psalms 148

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00