Psalms 17:15
“Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.”
Psalms 17:15 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 15 of 15 in Psalms chapter 17 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 17 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ. Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi. Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị. Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị. Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya. Ana m akpọku gị, O , nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m. Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha. Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị, site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m. Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ. Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala. Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu. Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume. O anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha. Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
Every verse in Psalms 17
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.