MyBibleAtlasAbụ Ọma 21

Abụ Ọma

Abụ Ọma 21

Psalm 21 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 21Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names David as its author. This is a royal Psalm that gives thanks for the strength, blessing and victory God gives the king.

Abụ Ọma 21 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya!

KJV verse 1: The king shall joy in thy strength, O LORD; and in thy salvation how greatly shall he rejoice!

I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị!

KJV verse 2: Thou hast given him his heart’s desire, and hast not withholden the request of his lips. Selah.

I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi.

KJV verse 3: For thou preventest him with the blessings of goodness: thou settest a crown of pure gold on his head.

Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

KJV verse 4: He asked life of thee, and thou gavest it him, even length of days for ever and ever.

Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya.

KJV verse 5: His glory is great in thy salvation: honour and majesty hast thou laid upon him.

Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị.

KJV verse 6: For thou hast made him most blessed for ever: thou hast made him exceeding glad with thy countenance.

Nʼihi na eze na-atụkwasị anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ.

KJV verse 7: For the king trusteth in the LORD, and through the mercy of the most High he shall not be moved.

Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị.

KJV verse 8: Thine hand shall find out all thine enemies: thy right hand shall find out those that hate thee.

Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.

KJV verse 9: Thou shalt make them as a fiery oven in the time of thine anger: the LORD shall swallow them up in his wrath, and the fire shall devour them.

Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ.

KJV verse 10: Their fruit shalt thou destroy from the earth, and their seed from among the children of men.

Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha.

KJV verse 11: For they intended evil against thee: they imagined a mischievous device, which they are not able to perform.

Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu.

KJV verse 12: Therefore shalt thou make them turn their back, when thou shalt make ready thine arrows upon thy strings against the face of them.

O anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.

KJV verse 13: Be thou exalted, LORD, in thine own strength: so will we sing and praise thy power.

Every verse in Abụ Ọma 21

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 210:00 / 0:00