Psalms 21:9
“Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha.”
Psalms 21:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 13 in Psalms chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O anyị, lee na eze na-aṅụrị ọṅụ nʼike gị. Obi na-atọkwa ya ụtọ nke ukwuu nʼihi mmeri niile i nyere ya! I nyela ya ihe obi ya chọrọ; i mekwaara ya ihe niile ọ rịọrọ gị! I ji ngọzị bara ụba nabata ya, ọ bụkwa okpueze e ji ọlaedo a ṅụchara nke ọma kpụọ ka i kpukwasịrị ya nʼisi. Ọ rịọrọ ka i nye ya ndụ, i zara ekpere ya mekwaa ka o nwee ogologo ndụ nke ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Nsọpụrụ ya dị ukwuu site na mmeri niile i nyere ya, ebube na ịma mma bụ onyinye i nyere ya. Nʼezie, i nyela ya ngọzị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, i mere ka o nwee obi ụtọ nke na-esite nʼọṅụ nke nọnyere gị. Nʼihi na eze na-atụkwasị anyị obi, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya site nʼịhụnanya nke kachasị ihe niile elu nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ị ga-anwụchi ndị iro gị niile; aka nri gị ga-ejidekwa ndị kpọrọ gị asị. Mgbe ị pụtara ịlụ ọgụ, ị ga-erepịa ha dịka ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu. Nʼoke iwe ya, Onyenwe anyị ga-elo ha, ọkụ ya ga-erepịakwa ha. Ị ga-esite nʼelu ụwa laa agbụrụ ha niile nʼiyi, ụmụ ha kwa site, nʼetiti ụmụ mmadụ. Nʼagbanyeghị na ha nwere ike ịpịa ọpịpịa ọjọọ megide gị, maọbụ tụpụta atụmatụ ọjọọ, ha agaghị emezu ebumnuche ha. Nʼihi na i ga-eme ka ha gbaghachi azụ mgbe i kwere ụta gị tụgide ha nʼihu. O anyị, ka e bulie gị elu nʼihi ike gị; anyị ga-abụ abụ ma tokwaa ike gị.
Every verse in Psalms 21
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.