Psalms 22:24
“Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.”
Psalms 22:24 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 24 of 31 in Psalms chapter 22 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 22 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile? O m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere. Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị . Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha. Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi. Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya. Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. “O na-atụkwasị anyị obi; ka anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.” Ma anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ m. Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso. Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke gbara m gburugburu. Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m. A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m. A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m. Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa. Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a. Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. Toonu anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ ọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ ! Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya. Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya. Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke anyị, ọ na-achịkwa mba niile. Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
Every verse in Psalms 22
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.