Psalms 27:12

“Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.”

Psalms 27:12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 12 of 14 in Psalms chapter 27 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 27 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; ọ bụladị na agha adaa imegide m, nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye anyị. Gee ntị mgbe m na-akpọku gị anyị. Meere m ebere, zaa m. Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O , Onye nzọpụta m, ahapụkwala m. Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m. Zi m ụzọ gị, O anyị; duo m nʼụzọ kwesiri nʼihi ndị na-akpagbu m. Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, ha na-ekupụ ihe ike dịka ume. Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma anyị nʼala ndị dị ndụ. Chere anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere anyị.

Every verse in Psalms 27

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00