Psalms 30:6

“Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.””

Psalms 30:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 6 of 12 in Psalms chapter 30 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 30 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Aga m eto gị, O anyị, nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. O anyị m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, ị gwọkwara m. O anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. Bụkuonụ anyị abụ, unu ndị nsọ ya, toonu aha nsọ ya. Iwe ya adịghị adịgide tee anya, ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, “Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.” O anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, adara m mba. Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị, “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?” O anyị, gee m ntị ma meere m ebere; O anyị, bụụrụ m onye inyeaka. I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. O anyị m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.

Every verse in Psalms 30

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00