Psalms 34:9

“Tụọnụ egwu Onyenwe anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya.”

Psalms 34:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 9 of 22 in Psalms chapter 34 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 34 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Aga m eto anyị mgbe niile. Mgbe niile ka otuto ya ga-adị nʼọnụ m. Mkpụrụobi m ga-anya isi na anyị; ka ndị niile a na-akpagbu gee ntị ṅụrịa ọṅụ. Soro m too anyị; ka anyị bulie aha ya elu. Nʼihi na etikuru m anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha. Onye ogbenye a kpọkuru anyị, ọ zakwara ya; ọ zọpụtara ya site na nsogbu ya niile. Mmụọ ozi anyị na-agba ndị niile na-atụ egwu ya gburugburu na-anapụtakwa ha. Jiri aka gị tulee ma hụkwa na anyị dị mma; onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye nke na-agbaba nʼime ya. Tụọnụ egwu anyị, unu ndị nsọ ya, nʼihi na ọ dịghị ihe na-akọ ndị niile na-atụ egwu ya. Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ anyị. Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu anyị bụ. Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma, chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha. Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya. Anya anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha; ma ihu anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ, ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka; ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu, ma anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam. Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie. Ihe ọjọọ ga-eme ka onye ajọ omume nwụọ; ndị na-akpọ onye ezi omume asị ka a ga-ama ikpe ọnwụ. Onyenwe anyị na-agbapụta ndị ohu ya; ọ dịghị onye ọbụla nke na-agbaba nʼime ya a ga-ama ikpe ọnwụ.

Every verse in Psalms 34

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00