Psalms 40:17

“Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka Onyenwe anyị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.”

Psalms 40:17 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 17 of 17 in Psalms chapter 40 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 40 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Eji m ndidi chere anyị, ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. O sitere nʼolulu na-amị amị, nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, abụ otuto nye anyị. Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, ha ga-atụkwasị obi ha nʼime anyị. Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye na-eme anyị ebe ntụkwasị obi ya; onye na-adịghị ele ndị mpako anya maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị. O anyị m, ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile ị kwadooro maka inye anyị; a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu. Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. O m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.” Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; dịka ị maara, o anyị, anaghị m emechi ọnụ m. Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ. O anyị, ezonarịla m ebere gị, ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile. Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, obi m na-adakwa mba nʼime m. O anyị, ya masị gị ịzọpụta m; O anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere. Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha. Ma ka ndị niile na-achọ gị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, “Onyenwe anyị dị ukwuu.” Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; ka anyị cheta m. Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; Ị bụ m, anọla ọdụ ịbịa.

Every verse in Psalms 40

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00