Psalms 56:3

“Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.”

Psalms 56:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 3 of 13 in Psalms chapter 56 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 56 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

O , meere m ebere, nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m. Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m. Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. Nʼime onye m na-eto okwu ya, nʼime ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ. Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m. Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; o , nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala. Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị? Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na nọnyeere m. Nʼime , onye m na-eto okwu ya, nʼime anyị, onye m na-eto okwu ya, nʼime ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? O m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; aga m ewetara gị onyinye ekele m niile. Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu , nʼìhè nke ndụ.

Every verse in Psalms 56

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00