MyBibleAtlasAbụ Ọma 57
Read all of Abụ Ọma 57

Abụ Ọma 57:8

Psalms 57:8

“Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.”

Abụ Ọma 57:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 8 of 11 in Abụ Ọma chapter 57 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Abụ Ọma 57 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl.

The cave is usually identified with the Cave of Adullam (1 Samuel 22:1). Tradition also suggests En-gedi (1 Samuel 24).

Meere m ebere, O , meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. Aga m akpọku nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. O , ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Obi m dị njikere, o , obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. O anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. O , ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

Every verse in Abụ Ọma 57

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

Abụ Ọma 570:00 / 0:00