Psalms 63:9
“A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa.”
Psalms 63:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 11 in Psalms chapter 63 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 63 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O , ị bụ m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m. A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi; ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa. A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi, ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa. Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime ; ndị niile na-eji aha aṅụ iyi ga-eto ya, ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.
Every verse in Psalms 63
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.