Psalms 66:6
“O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya.”
Psalms 66:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 6 of 20 in Psalms chapter 66 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 66 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo ! Bụọ abụ banyere ebube aha ya; meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube! Gwa okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! Ike gị dị nnọọ ukwu, ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; ha na-abụku gị abụ otuto, ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” Bịa lee ihe mere, ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ! O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ, ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee; bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya. Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, anya ya na-elekwa mba niile, ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. Toonu anyị, unu mmadụ niile, kwere ka a nụ ụda otuto ya; O chebela ndụ anyị, ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ. Nʼihi na ọ bụ gị, O , nwara anyị; ị nụchara anyị dịka ọlaọcha. Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị. I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile. Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, imezu nkwa m kwere gị nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m. Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu ; ka m kọọrọ unu ihe o meere m. Eji m ọnụ m kpọkuo ya; otuto ya dị m nʼire. Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị; ma gere ntị nʼezie, nụrụkwa olu arịrịọ m. Otuto dịrị , onye na-ajụghị ekpere m maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!
Every verse in Psalms 66
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.