MyBibleAtlasAbụ Ọma 73

Abụ Ọma

Abụ Ọma 73

Psalm 73 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 73Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading names Asaph as its author. This is a wisdom Psalm that wrestles with the prosperity of the wicked and finds security in God's presence.

Abụ Ọma 73 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼezie, Chineke dịịrị mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha.

KJV verse 1: Truly God is good to Israel, even to such as are of a clean heart.

Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.

KJV verse 2: But as for me, my feet were almost gone; my steps had well nigh slipped.

Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume.

KJV verse 3: For I was envious at the foolish, when I saw the prosperity of the wicked.

Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.

KJV verse 4: For there are no bands in their death: but their strength is firm.

Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.

KJV verse 5: They are not in trouble as other men; neither are they plagued like other men.

Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.

KJV verse 6: Therefore pride compasseth them about as a chain; violence covereth them as a garment.

Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.

KJV verse 7: Their eyes stand out with fatness: they have more than heart could wish.

Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.

KJV verse 8: They are corrupt, and speak wickedly concerning oppression: they speak loftily.

Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.

KJV verse 9: They set their mouth against the heavens, and their tongue walketh through the earth.

Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.

KJV verse 10: Therefore his people return hither: and waters of a full cup are wrung out to them.

Ha na-asị, “Olee otu ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe kachasị ihe niile elu maara?”

KJV verse 11: And they say, How doth God know? and is there knowledge in the most High?

Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.

KJV verse 12: Behold, these are the ungodly, who prosper in the world; they increase in riches.

Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.

KJV verse 13: Verily I have cleansed my heart in vain, and washed my hands in innocency.

Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.

KJV verse 14: For all the day long have I been plagued, and chastened every morning.

Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.

KJV verse 15: If I say, I will speak thus; behold, I should offend against the generation of thy children.

Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,

KJV verse 16: When I thought to know this, it was too painful for me;

tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ ; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.

KJV verse 17: Until I went into the sanctuary of God; then understood I their end.

Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.

KJV verse 18: Surely thou didst set them in slippery places: thou castedst them down into destruction.

Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!

KJV verse 19: How are they brought into desolation, as in a moment! they are utterly consumed with terrors.

Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.

KJV verse 20: As a dream when one awaketh; so, O Lord, when thou awakest, thou shalt despise their image.

Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba.

KJV verse 21: Thus my heart was grieved, and I was pricked in my reins.

Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.

KJV verse 22: So foolish was I, and ignorant: I was as a beast before thee.

Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.

KJV verse 23: Nevertheless I am continually with thee: thou hast holden me by my right hand.

Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.

KJV verse 24: Thou shalt guide me with thy counsel, and afterward receive me to glory.

Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.

KJV verse 25: Whom have I in heaven but thee? and there is none upon earth that I desire beside thee.

Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.

KJV verse 26: My flesh and my heart faileth: but God is the strength of my heart, and my portion for ever.

Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.

KJV verse 27: For, lo, they that are far from thee shall perish: thou hast destroyed all them that go a whoring from thee.

Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ nso. Emeela m kachasị ihe niile elu, bụ anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.

KJV verse 28: But it is good for me to draw near to God: I have put my trust in the Lord GOD, that I may declare all thy works.

Every verse in Abụ Ọma 73

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 730:00 / 0:00