Psalms 73:23
“Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m.”
Psalms 73:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 23 of 28 in Psalms chapter 73 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 73 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼezie, Chineke dịịrị mma, dịkwara ndị obi ha dị ọcha. Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ. Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo; mgbe m hụrụ ịba ụba nke ndị ajọ omume. Ha anaghị adọgbu onwe ha; ahụ ha gbara abụba, siekwa ike. Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere. Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe. Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; echiche ọjọọ ha enweghị ngụta. Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ. Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha. Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri. Ha na-asị, “Olee otu ga-esi mara? Ọ dịkwanụ ihe kachasị ihe niile elu maara?” Otu a ka ndị ajọ omume dị, ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa. Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ. Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ. Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị. Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute, tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ ; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ. Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi. Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam! Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, otu a, O anyị, mgbe i tetara, ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu. Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba. Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị. Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m. Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị. Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị. Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi. Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi. Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ nso. Emeela m kachasị ihe niile elu, bụ anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
Every verse in Psalms 73
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.