Psalms 81:3
“Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị;”
Psalms 81:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 3 of 16 in Psalms chapter 81 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 81 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Bụkuo bụ ike anyị abụ ọṅụ, tikusie ọb mkpu ike! Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une. Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị; nke a bụ iwu dịrị , ụkpụrụ nke ọb. O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye mgbe ọ pụrụ imegide . Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: “Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ. Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, azara m unu site nʼegbe eluigwe; anwara m unu na mmiri nke . “Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị ! Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. Abụ m anyị unu, onye kpọpụtara unu site nʼala . Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya. “Ma ndị m ekweghị ige m ntị. Izrel emekwaghị dịka m gwara ha. Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, ka ha soro nchepụta nke echiche ha. “Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, a sịkwa na ga-eso ụzọ m niile. Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile. Ndị niile kpọrọ anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi. Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”
Every verse in Psalms 81
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.