Psalms 83:14
“Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu,”
Psalms 83:14 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 14 of 18 in Psalms chapter 83 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 83 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ. Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha. Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya. Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha ọzọ.” Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị, ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị , na ndị , na ndị , na ndị , na ndị Amọn, na ndị , na ndị , ha na ndị Taịa. Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. Mee ha dịka i si mee ndị , na dịka i mere na , nʼakụkụ iyi ọn, ndị lara nʼiyi nʼ ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala. Mee ka ndị ọgaranya ha dịka na , ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka na , ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke .” O m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị. Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu, si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri. Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O anyị. Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala. Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ anyị, na ọ bụ naanị gị bụ kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.
Every verse in Psalms 83
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.