Psalms 84:5

“Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem.”

Psalms 84:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 5 of 12 in Psalms chapter 84 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 84 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, O anyị, Onye pụrụ ime ihe niile! Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, ịbata nʼogige anyị; mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu na-achọ dị ndụ. Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, O anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na m. Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; ha na-eto gị mgbe niile. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. Mgbe ha na-esite na na-agafe, ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya. Ike ha na-abawanye abawanye, tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu na ọn. O anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. Gee m ntị, gị nke ọb. Lekwasị anya nʼọta anyị, O , jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya. Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ m, karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume. Onyenwe anyị bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ. O anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.

Every verse in Psalms 84

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00