Psalms 86:10

“Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.”

Psalms 86:10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 10 of 17 in Psalms chapter 86 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 86 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Gee m ntị, O anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa. Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ m; meere m ebere, O m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile. Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m. Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. O anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere. Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m. Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ. Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube. Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ . Kuziere m ụzọ gị, O anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. Aga m eji obi m niile too gị, O anyị, na m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. O , ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi. Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.

Every verse in Psalms 86

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00