Psalms 93:4

“Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri.”

Psalms 93:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 4 of 5 in Psalms chapter 93 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 93 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. Oke osimiri niile amaliela elu, O anyị; oke osimiri niile eweliela olu ha elu; ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ. Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri. Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.

Every verse in Psalms 93

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00