Psalms 94:17
“A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ.”
Psalms 94:17 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 17 of 23 in Psalms chapter 94 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 94 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
O anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, o , onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị. Bilie, o nke ụwa; kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha. Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ? Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ. Ha na-azọpịa ndị gị, O anyị; ha na-emegbu ihe nketa gị. Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; ha na-egbu ndị na-enweghị nna. Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; Chineke ọb na-agba nkịtị.” Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe? Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ? Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma? Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O anyị, onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị; ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu. Nʼihi na anyị agaghị ajụ ndị ya; ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ. Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya. Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe? A sị na anyị abịaghị nyere m aka, agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ. Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” ọ bụ ịhụnanya gị, O anyị, kwagidere m. Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ. A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya? Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ. Ma anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, na m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ. Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; Onyenwe anyị anyị ga-ala ha nʼiyi.
Every verse in Psalms 94
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.