MyBibleAtlasAbụ Ọma 95

Abụ Ọma

Abụ Ọma 95

Psalm 95 in Igbo and English (KJV) · Abụ Ọma 95Tap any highlighted word for context

English only (KJV)

About this Psalm

The Psalm heading does not name an author. This is a praise Psalm that invites joyful worship and warns God's people not to harden their hearts.

Abụ Ọma 95 — Scripture text (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.

KJV verse 1: O come, let us sing unto the LORD: let us make a joyful noise to the rock of our salvation.

Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.

KJV verse 2: Let us come before his presence with thanksgiving, and make a joyful noise unto him with psalms.

Nʼihi na anyị bụ dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu.

KJV verse 3: For the LORD is a great God, and a great King above all gods.

Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.

KJV verse 4: In his hand are the deep places of the earth: the strength of the hills is his also.

Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.

KJV verse 5: The sea is his, and he made it: and his hands formed the dry land.

Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu anyị, onye kere anyị;

KJV verse 6: O come, let us worship and bow down: let us kneel before the LORD our maker.

nʼihi na ọ bụ anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,

KJV verse 7: For he is our God; and we are the people of his pasture, and the sheep of his hand. To day if ye will hear his voice,

“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na , maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na nʼime ọzara,

KJV verse 8: Harden not your heart, as in the provocation, and as in the day of temptation in the wilderness:

ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.

KJV verse 9: When your fathers tempted me, proved me, and saw my work.

Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’

KJV verse 10: Forty years long was I grieved with this generation, and said, It is a people that do err in their heart, and they have not known my ways:

Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”

KJV verse 11: Unto whom I sware in my wrath that they should not enter into my rest.

Every verse in Abụ Ọma 95

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

KJV: public domain

Abụ Ọma 950:00 / 0:00