Psalms 95:1

“Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.”

Psalms 95:1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 1 of 11 in Psalms chapter 95 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 95 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo anyị abụ; ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. Ka anyị jiri ekele bịakwute ya jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. Nʼihi na anyị bụ dị ukwuu, eze ukwuu kachasị chi niile elu. Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya. Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, aka ya kpụrụ ala akọrọ niile. Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu anyị, onye kere anyị; nʼihi na ọ bụ anyị anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, “Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na , maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na nʼime ọzara, ebe nna nna unu ha nwara m, nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere. Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, ha amatabeghị ụzọ m niile.’ Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”

Every verse in Psalms 95

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00