Psalms 96:10

“Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.”

Psalms 96:10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 10 of 13 in Psalms chapter 96 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Psalms 96 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Bụkuonụ anyị abụ ọhụrụ, bụkuonụ anyị abụ, unu ụwa niile. Bụkuonụ anyị abụ, toonu aha ya; kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ. Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile, kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche. Nʼihi na anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa. Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu, maọbụ anyị kere eluigwe niile. Ịma mma na ebube dị nʼihu ya; ike na otuto dị nʼebe nsọ ya. Nyenụ anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche, nyenụ anyị nsọpụrụ na ike. Nyenụ anyị nsọpụrụ ruuru aha ya; werenụ onyinye bata nʼime ogige ya. Kpọọnụ isiala nye anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya; maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya; ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe. Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya. Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ. Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu anyị, nʼihi na ọ na-abịa, ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe, jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.

Every verse in Psalms 96

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00