Psalms 67:2
“Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.”
Psalms 67:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 2 of 7 in Psalms chapter 67 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Psalms 67 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ka meere anyị amara ma gọzie anyị, ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. Ka mmadụ niile too gị, O ; ka mmadụ niile too gị. Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, na-edukwa mba niile nke ụwa. Ka mmadụ niile too gị, O ; ka mmadụ niile too gị. Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, Chineke, onye bụ anyị, ga-agọzikwa anyị. Chineke ga-agọzi anyị, nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Every verse in Psalms 67
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.